Ezekiel 9

Ikpe ọmụma dịrị ndị na-ekpere arụsị

1Mgbe ahụ, a nụrụ m ka o ji oke olu kpọọ oku sị, “Bịanụ nso, unu bụ ndị ahọpụtara ilekọta obodo a, onye ọbụla jidekwa ngwa agha nʼaka ya.” 2A hụrụ m ndị ikom isii si nʼọnụ ụzọ ama nke dị nʼakụkụ ebe dị elu na-apụta, nke chere ihu nʼugwu, onye ọbụla jikwa mma agha nʼaka ya. Otu onye nʼime ha yi uwe akwa ọcha, nyarakwa nwa akpa nke ihe e ji ede akwụkwọ dị nʼime ya. Ha niile batara nʼime ụlọnsọ, guzokwa nʼakụkụ ebe ịchụ aja e ji bronz wuo.

3Ma ebube nke Chineke Izrel sitere nʼelu cherubim ndị ahụ, ebe ọ nọ na mbụ, bilie bịa guzokwa nʼọnụ ụzọ ụlọnsọ ahụ. Mgbe ahụ, Onyenwe anyị kpọrọ nwoke ahụ yi uwe akwa ọcha bụ onye nya akpa ahụ nke ihe e ji ede ihe dị nʼime ya, 4ọ sịrị ya, “Bilie, jegharịa nʼokporoụzọ niile nke obodo Jerusalem, kakwasị akara nʼegedege ihu ndị niile na-akwa akwa na ndị niile na-asụ ude nʼihi ihe arụ niile nke a na-eme nʼime ya.”

5Anụkwara m ka ọ gwara ndị ọzọ, “Soronụ ya baa nʼime obodo, gbukwaanụ, unu emekwarala onye ọbụla ebere maọbụ ọmịiko. 6Gbuonụ ha niile, ndị okenye, na ụmụ okorobịa, na ụmụ agbọghọbịa, na ndị inyom, na ụmụntakịrị. Ma unu emetụkwala onye ọbụla nwere akara ahụ nʼihu ya. Malitenụ nʼebe a, nʼime ụlọnsọ ukwu m.” Ya mere, ha malitere igbu ndị okenye ndị nọ nʼihu ụlọnsọ.

7Ọ sịkwara ha, “Merụọnụ ụlọnsọ a! Werekwanụ ozu ndị unu gburu egbu tụjuo nʼime ogige ya! Gaanụ!” Ha pụrụ baa nʼime obodo, bido igbu ndị mmadụ. 8Mgbe ha nọ na-egbu ndị mmadụ maọbụ naanị m fọdụrụ, adara m nʼala kpuchie ihu m, tie mkpu akwa, sị, “Ewoo, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị! Ị ga-esite nʼoke iwe ị na-eweso Jerusalem bibie ihe niile fọdụrụ nʼIzrel?”

9Ọ sịrị m, “Mmehie niile nke ụlọ Izrel na Juda dị ukwuu rie nne. Ala niile jupụtakwara nʼọbara ndị egburu, obodo jupụtakwara nʼikpe ikpe na-ezighị ezi. Nʼihi na ha na-asị, ‘Onyenwe anyị esitela nʼala anyị wezuga onwe ya. Ọ dịghị ihe Onyenwe anyị na-ahụ.’ 10Nʼihi ya, agaghị m ahapụ ha, agakwaghị m enwe ọmịiko nʼahụ ha. Aga m akwụghachi ha nʼihi ihe ọjọọ niile ha mere.”

11Mgbe ahụ, nwoke ahụ yi uwe akwa ọcha, nke nya akpa nke ihe e ji ede akwụkwọ dị nʼime ya, lọghachiri sị, “Arụchaala m ọrụ i nyere m ịrụ.”

Copyright information for IboBIU